Etu esi akwado uleakwụkwọ: Ihe ikwesiri ịma

Ebe foto si, Getty Images
- Onye dere ya, Eva Ontiveros
- Ndị mere akụkọ a, BBC World Service
- Mgbe e biputara ya
Ọ bụrụ na ị na-akwado ụle, ma ịmaghị ebe ị ga ebido ebido ezie, anyị depụtara gị ihe ole maọbụ ole bụ ihe dị ị ga elebere anya nke ga-enyere gị aka ịkpokota echiche gị ma ichetakwa ya bụ ihe ị
gụrụ mgbe ule.
Ihe ndị bụ ihe anyị jụtara ndị ọkamụta dị icheiche ma ụmụakwụkwọ ụbụrụ ha na-anụ ọkụ.
1. Ịgba ụchụ na nrị ụbụrụ

Ebe foto si, Getty Images
Makana ụbụrụ gị chọrọ ike ọ ga-etinye n'ọrụ, nrị ụtụtụ di oke mkpa.
Nri dị ka "oat", bredi, milik, akwa, azụ tomatosu, ube Bekee na-adị mma iji gbaa ụchụ ụtụtụ.
Mkpụrụ osisi ndị ọzọ dị iche iche na-adịkwa mma n'ụtụtụ.
2. Malite n'oge kwadowa

Ebe foto si, Getty Images
Bido ị gụ akwụkwọ n'oge. Echela ka oge gawa tupu ị bido amaka emee ngwangwa emerghara ọdachi
Ọ na-adịkwa mma ị gụ akwụkwọ n'ụtụtụ karịa n'ihihie mgbe anwụ pụtara.
Ọ na-adịkwa mma ịnye oge ị ga-eji agụ akwụkwọ kwa ụbọchị.
Ekwela ka chi folahụ gị ebe ị na-agụ akwụkwọ.
3.Mara ụdị ule ị na-aga

Ebe foto si, Getty Images
Ule ị na-a ga ọ bụ nke edemede, ajụjụ ọnụ ka ọbụ nke ọrụaka?
Ule ọbụla nwere ụzọ esi agụ ya. Ule edemede ekwesighị ka ị gụcha ihe niile asị ka agụọ. Tinye echiche gị n'ole maọbụ ole gụọ ya nke ọma. Ọ bụrụkwanụ ule họrọ otu, ị kwesiri ị gụ karrịa nke a mana ị gaghị agụmị ya agụmị ka nke edemede.
Ọ dị mkpa na ị nwere akwụkwọ gosiri ịhe ịkwesiri ị gụ maka ule ahụ.
4. Hazie usoro agụm akwụkwọ gị

Ebe foto si, Getty Images
Depụta usoro agụm akwụkwọ gị na ihe niile ị kwesiri ị gụ. Tinyekwa oge ị ga-eji gwuo egwu maọbụ megharịa ahụ.
5. Onye onwe gị ohere

Ebe foto si, Getty Images
Akpọdola isi n'akwụkwọ mgbe dum.
Emekwala ka ị bụrụ mkpụrụ akwụkwọ niile n'isi nke Bekee kpọrọ "Cramming", ma ka ahụ ghọta ihe ị na-agụ.
Ịdepụta ihe na mpempe akwụkwọ, ịche echiche maka ihe ị na-agụ, gị na ibe gị ịkpa maka ihe ụnụ gụru, itinye onwe gị na "tape" maọbụ na-ekwwntị mgbe ị na-agụ ya ma kpọọ ya mgbe ị mechere, bụ ụzọ ị ga-esi echeta ihe ị gụrụ.
6. Nye onwe gị ule

Ebe foto si, Getty Images
Ụzọ kacha mma iji mata ma ihe ị gụrụ aka dịkwa bụ itinyere onwe gị ule maọbụ jụọ onwe gị ajụjụ mgbe ị gụchara.
7. Kuziere onye ọzọ

Ebe foto si, Getty Images
Ga kuziere onye ọzọ ihe ị mụtara iji mara ka ị mụtala ya nke ọma.
8. Dowe ekwentị n'ụsọ

Ebe foto si, Getty Images
Ekwela ka ekwentị gị megharịa gị anya. Dowe ya n'ụsọ mgbe ị na-agụ akwụkwọ.
9. Ejila egwu agụ akwụkwọ

Ebe foto si, Getty Images
Nchọpụta gosiri na ndị anaghị eji egwu agụ akwụkwọ ka eche karịa ndị ji egwu agụ.
10.Nwee ezumike kwa mgbe

Ebe foto si, Getty Images
Ọ na-adịkwa mkpa ịgwụ egwụ mgbe ị gụchara akwụkwọ ma nara ikuku ndụ. Nke a ga-eme ka akwụkwọ gụọ gị agụ ọzọ.
11. Ụra ndị oke mkpa

Ebe foto si, Getty Images
Nye onwe gị ezigbo ụra abalị. Emela ka ị gụọ akwụkwọ abalị niile. Tinye oge ị kwesiri iji nakpuo ụra.
12. Dere jụụ ma buru n'uche na ihe niile adịla mma

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua ị mụtala ihe ị ga-eme ka akọ na uche gị zuo oke bụ nke ndị oka muta mere nchọpụta puru iche onweghị ihe ọfọrọ gị ugbua.


































