Ihe ị kwesịrị ịma maka 'Portable Omolalomi'

Ebe foto si, portablesbaeby/IG
Onye oti egwu na Naijirịa eji Portable Omolalomi mara bụ onye ọtụtụ ndị mmadụ kpụ n’ọnụ ugbua.
Ọtụtụ ndị nsonso ya na-akpọ ya nwa ihu ọma maka etu o siri rịa were bụrụ onye oti egwu ama ama.
Ọ bụ egwu ya ọ kpọrọ ‘Zazzu Zeh’ nke ya na oti egwu ama ama bụ Olamide na Poco Lee tiri mere ka ọ bụrụ onye oti egwu ama ama.
O sorola ndị dịka Tiwa Savage, Wizkid na ndị ọzọ tie egwu.
Ihe Ị kwesịrị ịma maka Portable
Habeeb Okokiola eji Portable Omolalomi mara bụ oti egwu ama ama.
A mụrụ ya n’ọnwa Maachị ,ụbọchị iri na abụọ nke afọ 1994.
Ọ bụ onye Ogun steeti.
Ọ gụchaghị akwụkwọ dịka o kwuru na ọ hapụrụ agụmakwụkwọ were chụwa ego n’iti egwu.
Kamgbe o bidoro iwu dịka oti egwu, ndị nsonso Omolalomi na soshal Midia ọkachasị na ‘Instagram’ arịala elu karịa mmadụ puku narị atọ na iri ise.
Ugboro ole ka Portable Olalomi mere ihe kpatara ka o wuo na soshal Midịa?

Ebe foto si, portablesbaeby/IG
Olalomi Portable ewuola ụfọdụ mgbe na soshal midịa kama nsonso a ka ndị uweojii nyere iwu ka enyocha ya maka ihe o kwuru.
Ọ bụ m bidoro otu nzuzo ‘One million Boys’ na ‘Ajah Boys’ – Olalomi Portable
Ndị uweojii Naijirịa enyela iwu ka anwuchie Olalomi Portable dịka o kwuru na ọ bụ ya bidoro otu nzuzo ‘One million Boys’ na ‘Ajah Boys’ na Legọs steeti.
Ọ bụ n’ihe onyonyo ọ mere ka o kwuru nke a.
O ji otu onye gbaa ama were sị, “Gaa jụọ Sammy Larry”.
Otu nzuzo abụọ a na-enye nsogbu na Legọs na Ogun Steeti.
Ihe onyeisi ndị uweojii Naijirịa kwuru maka Olalomi Portable
Onyeisi ndị uweojii na Naijirịa bụ Usman Alkali Baba ekwuola ka ebido nyocha maka ihe Portable kwuru mgbe o sị na ọ bụ ya bidoro otu nzuzo ‘One Million Boys’.
Baba gwara kọmịshọna ndị uweojii nke Legọs steeti na-ekwesịrị ime nyocha ma mmadụ kwuo okwu etu Olalomi Portable siri kwuo.

Ebe foto si, portablesbaeby/Facebook
Ihe Olalomi Kwuru maka nke a
Kama Olalomi mechara kwuo sị na ‘One Million Boys’ ọ na-akpọ aha ha bụ ndị nsonso ya bụ ụmụ nwoke na ọ bụghị maka otu nzuzo.
O kwuru sị na ọ bụghị onye ohi na ọ bụ nwa azụrụ nkeọma.
O kwuru sị, “ anaghị m ezu ohi, ọ bụ ndị nsonso m bụ ‘One million Boys’ m kpọrọ aha, ọ bụghị ndịnke na-ezu ohi.































