“Nna m gbara ihe m ji agba ọsọ ọkụ” – Tobi Amusan

Ebe foto si, Getty Images
Tobi Amusan abụrụla ọkaibe n’ịgba ọso hurdles n’ụwa niile ma bụrụkwa onye kacha agba ọsọ Hurdles kama ọ naghị echefu mgbe nna ya gbara agụrụngwa o ji agba ọsọ.
Tobi onye dị afọ iri abụọ na ise ji tịnkọm tinkọm iri na abụọ na ụma iri na abụọ were merie n’agba tupu nke ikpeazụ ma mechaa tụrụugo na agba nke ikpeazụ ma rite ọlaedo.
O kwuru sị, “ Nne na Nna m bụ ndị nkuzi, a kwenyere na m kwesịrị itinye uchu n’akwụkwọ.
Nke a mere ha ji tinyere m anya dịka nwaanyị n’ihi ha chere na m nwereike agaghịm aba uru”.
“Nne m hụrụ ihe m na-ahụghị n’ime onwe m nke mere o ji enyem ohere ka m gaa gbaa ọsọ ma sịkwam na m etujula ya ihu”.
“Nke amere na nne m ga-agwa nna m na m gara akwụkwọ maọbụ asọmpị akwụkwọ kama ọ bụ ama egwuregwu maọbụ asọmpị ọsọ ka m na-aga”.
O kwuru sị, “Mgbe nna m chọpụtara, ọ gbara akụrụngwa niile m ji agba ọsọ ọkụ ma kwa nne m na ọchọghịzị ịhụ m n’ama agwuregwu ọbụla”.
Kama dịka afọ olemaole gachara, Tobi tụrụugo na World Athletics Championship, akwa ọnụ juputara n’ihu ya dịka a na-agụ egwu mba Naijirịa.
Tobi kwuru sị, “ Ọbatabeghị m n’obi na m meriri ma tụrụugo pụrụiche, onwereike ka oge na-aga ọ ga-edo m anya”.
O gara n’ihu sị, “ mgbe ọbụla m pụtara ịgba ọsọ, a na m enye ya ihe niile m ji biri kama ọ bụ onye nke anọ ka m na-agba. Kama nke a nyere m ọlaedo ma mee kwa m ọkaibe n’oge m jiri gbachaa ọsọ ahụ”.
Etu ọsọ na egwuregwu bọọlụ si mee ya ọkaibe ọsọ hurdle
N'afọ 2016 n'ọnwa Nọvemba ka Amusan dere na Twitter ya sị, "Enweghị onye ma m ugbua, mana m ga-emecha bụrụ onye agaghị echefu echefu. A ga ma agbado anya, a ga m enwe mmeri".
Kama ọ Amusan ịbụ onye na-agba ọsọ dịka ihe ọ na-akwadoghị akwado nke bidoro n'ụlọ akwụkwọ Sekọndrị nke Our Lady of Apostles dị n'Ogun Steeti.
Amusan sị, "Ọ bụ egwuregwu bọolụ ka m na-agba na mbụ kama a na m eji ọsọ agbazu ebe niile".
"Onye nkuzi m dụrụ m ọdụ ka ma gaa sonye ndị na-agba ọsọ. ebe ahụ ka m gara were bụrụ nwaanyị kacha agba ọsọ ma soro na ndị ọsọ Relay".
Edemede a nwere ihe ndị si na X. Anyị na-achọ ka i nye anyị ikike tupu e tinye ihe ọbụla, dịka akụrụngwa cookies na tekịnụzụ ndị ọzọ nwereike ịdị na ya. I nwereike ịgụ X iwu cookie na iwu nzuzo tupu ị nabata ya. Iji kirie ihe nọ n'ime ya, họrọ 'nabata na gaa n'ihu'.
End of X post
O soro ndị otu Naijirịa na Africa Youth Games emere na Naijirịa n'afọ 2013 kama osoghị ndị ọsọ relay ma rite ọla nchara na asọmpị Long Jump.
Ịgba ọsọ hurdles bụkwa ihe ọzọ Tobi atụghịanya na ọ ga-enye ya ntụrụugo.
Ọ kọwara sị, "ụfọdụ mgbe ndị nkụzi ga-ahọrọ ndị ha chọrọ maka ọsọ relay ma sị na ị ị ka na-ebido ịgba ọsọ".
"Ọ bụ nnukwu nsogbu dịirị m, nke mere na m chọrọ ịkwụsị ịgba ọsọ. A chọrọ iso ndị otu Naijirịa nke nnukwu gaa asọmpị nke mere ka ụfọdụ ndị nkuzi gwa m ka m tinye anya n'ọsọ hurdles".
Njem ya na mba Amerịka na ịgba onye nke anọ kwamgbe kwamgbe

Ebe foto si, Getty Images
Ugbua, i nwereike inweta akụkọ BBC Igbo niile n'ekwenti gị.
Pịa aka ebe a ka i soro anyị
Ebe Ọkwa azụmahịa WhatsApp kwụsịrị
Agbanyeghị na ndị ọrụ nagalaba ọsọ na Naijirịa enweghị ntụkwasị obi n'ebe Amusan nọ, o jisiri ike rite ntụrụugo n'ọsọ Hurdles na asọmpị Afrịka niile emere na Congo-Brazzaville n'afọ 2015.
"Atụghịanya na mga-erite ntụruugo n'asọmpị ahụ kama egosiri m ha na m ga-emenwu ya. Nuụrụugo a gbanwere ndụ m".
O kwuru sị, "Etu a ka m siri nweta ohere ịgụ akwụkwọ n'efu na mba Amerịka".
Kamgbe Amusan banyere mahadum El Paso, Texas, enweghịzị onye hụrụ azụ ya anya.
O ritere ntụruugo ọla edo na 100m Hurdles n'asọmpị Commonwealth nke afọ 2018 memere na mba Ọstrelịa, ma titekwa ntụrụugo mbụ ya n'asọmpị Afrikan Championships n'Asaba Naijirịa.
Kama n'asọmpị mba ụwa niile, ọ naghị eme nke ọma dịka ọ na-agbakarịri onye nke anọ.
Dịka ịgba onye nke anọ n'asọmpị World Championship na Doha, Japan afọ atọ gara aga.
O kwuru na nne ya na-akwado ya oge a kama nna ya achọghị ịma.
Ugbua, ọkaibe a ritere otu puku narị dọla dịka o gosiri na ọ bụ ọkaibe n'asọmpị Oregon.
Ugbua Amusan bụzị ọkaibe, Nna ya ga-esoro na ntụrụugo ya.

Ebe foto si, Getty Images
































