Etu onye nkuzi jiri aka higbuo nwata n'ụlọ akwụkwọ n'Ondo steeti

Ebe foto si, Getty Images
N'obodo Arogbo n'okpuruọchịchị Ese-odo nke Ondo steeti nọ n'akwa arịrị kamgbe ụbọchị Mọnde ụbọchị 3 Julaị 2023 maka otu onye nkuzi e boro ogbugbu otu nwa dị afọ iri na asaa a kpọrọ Timibra Meretighan n'ụlọakwụkwọ dị n'Ondo steeti.
Dịka onye ntaakụkọ BBC Yoruba siri kwuo na Timibra na ndị enyi ya na-ele ule ha n'ụlọakwụkwọ Ijaw National High School dị n'Arogbo n'ụbọchị ahụ tupu Oke abaa n'ime ụlọakwụkwọ ha ịchụpụ ụmụakwụkwọ n'ezi. Anya hụrụ ihe mere kọwara na onye nkuzi ha na-achupụzịa ụmụakwụkwọ n'ezi wee jiri aka ya higbuo Timibra olu.
Ihe a wee kpata mkpọtụ na ọgbaaghara tupu ndị uweojii wee machie nwoke ahụ n'ụlọakwụkwọ.
Gịnị ka ndị uweojii kwuru?

Ebe foto si, Funmilayo Odunlami-Omisanya
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii n'Ondo steeti a kpọrọ Funmilayo Odunlami-Omisanya gwara BBC Yoruba na nke a bụ eziokwu na ha anwụchiela nwoke a e chere na o jiri aka na higbuo nwata akwụkwọ ya nga.
Nkọwa ka ihe si wee me:
Ọdunlami-Omisanya kọwara na onyeisi ụlọakwụkwọ ha gbagara kpọọ ndị uweojii mgbe ihe a mere. Ọ sị na otu nwoke “ọkunrin kan, dị afọ 27 gbabara n'ime ụlọ ndị nche n'ụlọakwụkwọ ha izo ezo maka mmriri ozuzo mana wee gbuo otu n'ime ụmụ akwụkwọ.
Ọnụ na-ekwuchitere ndị uweojii a kwukwara na “Timibra Meretighan, bụ nwa dị afọ 17 si obodo Arogbo-Ibe n'Ondo nwamadị a ahigbuo ya n'olu maka na nwata akwụkwọ a na ibe ya so akpọ ya bụ onye nkuzi onye ara.”
Ọ sị na onye nkuzi a ga-anọ na be ha ruo mgbe ha ga-emezu nnyocha ha.




























